Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Lihaị, Nna nke Nifaị


Lihaị, Nna nke Nifaị

N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, otu onye-amụma Hibru onye duuru ezi na-ụlọ na ndị nso-nso ya nile site na Jerusalem gaa n’ala e kwere na nkwa n’ime mpaghara ọdịda-anyanwụ ọkara ụwa ihe dịka 600 tutu a mụọ Kraịst. Lihaị bụụrụ onye amụma mbụ n’etiti ndị ya n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn.

Lihaị sitere na Jerusalem gbalaga n’inye-iwu nke Onye-nwe (1 Nif. 2:1–4). Ọ bụụrụ nwa nwa nke Josef, onye e rere baa n’Ijipt (1 Nif. 5:14). Onye-nwe nyere ya ọ̀hụ́ nke osisi nke ndụ (1 Nif. 8:2–35). Lihaị na ụmụ ya ndịkom wuru ụgbọ mmiri wee gbadaa gaa ọdịdị-anyanwụ ọkara ụwa (1 Nif. 17–18). Ya na ụmụụmụ ya bịara bụrụ ndị e hiwere n’ala ọhụrụ (1 Nif. 18:23–25). Tutu ya anwụọ, Lihaị gọziri ụmụ ya ndịkom na kuziere ha banyere Kraịst na mbịarụte nke Akwụkwọ nke Mọmọn n’ụbọchị ndị ikpe-azụ (2 Nif. 1:1–4:12).

Akwụkwọ nke Lihaị

Joseph Smith jiri akwụkwọ nke Lihaị malite mgbe ọ na-atụgharị asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Ọ bụụrụ akụkọ ndekọta nke Mọmọn mere na mkpirisi site na epekele nile nke Lihaị. Mgbe o nwetasịworo ibe akwụkwọ e dere ede dị 116 nke ọ tụgharịsiworo asụsụ site n’akwụkwọ a, Joseph nyere Martin Harris ibe akwụkwọ ndịa bụ onye rụworo ọrụ nwoge-nta dịka onye ode-akwụkwọ na ntụgharị-asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Ibe akwụkwọ ndị a furu efu mgbe ahụ. Joseph a tụgharịkwaghị asụsụ nke akwụkwọ nke Lihaị ọzọ iji dochie akwụkwọ e dere ede ahụ furu efu, mana n’ọnọdụ nke a ọ tụgharịrị nkọwasị nile ndị ọzọ metụtara ha site n’ime epekele ọla-edo nile (hụ okwu mmalite nile e nyere OznỌd. 3, 10). Nkọwasi ndị nke ọzọ ndị a nile ugbua bụ akwụkwọ isii nile nke mbụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn.