Mmekọrịta nke nwoke na nwoke, na nwanyị na nwanyị Hụ kwa Inwe mmetụta, Nke mmetụta; Ịkwa-iko Mmekọrịta nke ndị mmadụ n’onwe ha na ndị dịka ha na nwoke ma-ọbụ na ndị bụ nwanyị n’ụdị idina-edina. Chineke jụrụ mmekọrịta omume ndina dị otu a. Mee ka ha pụtakwute anyị, ka anyị mara ha, Jen. 19:1–11 (Moses 5:51–53). Gị na nwoke edinala dịka nwoke na nwanyị na-edina, ọbụ ihe-arụ, Lev. 18:22 (Lev. 20:13). A gaghị enwe onye edoro iche maka ndina nwoke na nwoke na etiti ụmụ ndịkom nke Israel, Deut. 23:17. Ha na-egosipụta mmehie ha dịka Sọdọm, ha ezoghi ya ezo, Aịsa. 3:9 (2 Nif. 13:9). Ndịkom na-ere ọkụ n’agụụ n’arụ ndịkom ibe ha, Ndị-Rom 1:27. Ndị na-emerụ onwe ha n’arụ ndịkom a gaghị ekete ala-eze Chineke, 1 Ndị-Kọ 6:9–10. A dịghị enye onye ezi-omume iwu, kama a na-enye ndị na-emeru onwe ha na ndị nwoke iwu, 1 Tim. 1:9–10. Ndị ahụ na-apụ soo anụ arụ dị iche iche ka e debeworo dịka ihe ngosi, na-ahụ ahụhụ ịbọ ọbọ nke ọkụ ebighi-ebi, Jud 1:7.