Mmata-ihe Hụ kwa Amamihe; Ezi-okwu; Nghọta Nghọta na ịghọta-nke-ọma, nke ka nke banyere ezi-okwu dịka Mụọ kụziri ma-ọbụ mesie-ike. Onye-nwe bụ Chineke nke ọmụma-ihe, 1 Sam. 2:3. Onye-nwe zuru-oke na ọmụma-ihe, Job 37:16. Egwu nke Onye-nwe bụ mmalite ọmụma-ihe, Ilu 1:7. Onye na-egbochi okwu-ọnụ ya nwere ọmụma-ihe, Ilu 17:27. Ọmụma-ihe nke Onye-nwe ga-ejupụta-ụwa, Aịsa. 11:9 (2 Nif. 21:9; 30:15). Unu wepụrụ ọtụghe-ụzọ nke ọmụma-ihe, Luk 11:52. Ịhụn’anya Kraịst karịrị ọmụma-ihe, Ndị-Efe. 3:19. Tụkwasịrị nụ okwukwe unu ezigbo-omume, ma nyere ezigbo-omume ọmụma-ihe, 2 Pita 1:5. Nifaị nwere nnukwu mmata-ihe banyere ịdị-mma nke Chineke, 1 Nif. 1:1. Ha ga-abịa n’ọmụma nke Onye-mgbapụta ha, 2 Nif. 6:11. Ndị ezi-omume ga-enwe mmata-ihe zuru oke maka ezi-omume ha, 2 Nif. 9:14. Mụọ ahụ na-enye mmata-ihe, Alma 18:35. Ọmụma-ihe unu e zuwo oke n’ihe ahụ, Alma 32:34. A ga-akpọta ndị Leman n’ezi ọmụma-ihe nke Onye-mgbapụta ha, Hil. 15:13. Ka unu wee jiri ọmụma-ihe zuru oke mata na ọ bụ nke Chineke, Moro. 7:15–17. Ndị-nsọ ga-achọta nnukwu akụ nile nke mmụta, OznỌd. 89:19. Mmụta na-enweghị ntụpọ ga-eme ka mkpụrụ-obi buwanye ibu, OznỌd. 121:42. Onye ahụ nke nwere ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja dị nsọ, enweghị nsogbu inweta ọmụma-ihe nke ezi-okwu nile, OznỌd. 128:11. Ọbụrụ na onye ọbula e nwee mmụta na ndụ nke a ọ ga-enwe nnukwu uru na ụwa na-abịa, OznỌd. 130:19. Ọ gaghị-ekwe omume izọpụta onye ọbụla na-amaghị ama, OznỌd. 131:6.