Ntọhapụ Hụ kwa Inwere-onwe, Nnwere-onwe; Ndọkpụ n’Agha; Ohere-ịhọrọ Ụdị ma-ọbụ ọnọdụ inwe ike iji inwere-onwe mee ihe na chee echiche. Nrube-isi nye ụkpụrụ nile nke ozi-ọma na-atọhapụ mmadụ site n’oru nke mụọ mmehie (Jọn 8:31–36). M ga-ejegharị na ntọhapụ; n’ihi na usoro iwu gị ka m chọworo, Abụọma 119:45. Ebe ahụ Mụọ nke Onye-nwe nọ, ebe ahụ ka ntọhapụ dị, 2 Ndị-Kọ 3:17. Na-eguzosinụ ike na ntọhapụ ahụ nke Kraịst si na ya mee ka anyị nwere onwe anyị, Ndị-Gal. 5:1 (OznỌd. 88:86). Ndị mmadụ nwere onwe ha ịhọrọ ntọhapụ na ndụ ebighi-ebi, 2 Nif. 2:27. Ala nke a ga-abụ ala nke ntọhapụ, 2 Nif. 10:11. Moronaị kụnyere ihe nlere-anya nke ntọhapụ n’etiti ndị Nifaị, Alma 46:36. Onye-nwe na ndị-odibo ya wee maa ọkwa ntọhapụ nye mụọ nile a dọkpụụrụ n’agha, OznỌd. 138:18, 31, 42.