Ịbụ onye a mụrụ ọzọ pụtara Mụọ nke Onye-nwe iweta mgbanwe dị ukwuu n’ime obi mmadụ otu na ọ gaghị enwe agụụ ime ihe ọjọọ, kama ya e nwee agụụ ịchọ ihe nile nke Chineke.
Ndị ahụ kweere n’aha Kraịst ka a mụrụ ọbụghị site n’ọbara, kama-ọbụ site na Chineke, Jọn 1:12–13 .
Ma ọbụghị ma a mụrụ mmadụ site na mmiri na mụọ ahụ, ọ pụghị ịbata n’ime ala-eze Chineke, Jọn 3:3–7 .
E nwere ike mụọ anyị ọzọ site n’okwu Chineke, 1 Pita 1:3–23 .
Onye ọbụla a mụrụ site na Chineke a dịghị aga n’iru n’ime mmehie, NAJS, 1 Jọn 3:9 .
N’ihi na ihe ọbụla a mụrụ site na Chineke na-emeri ụwa, 1 Jọn 5:4 .
Ndị ahụ a mụrụ site na Kraịst na-agba ndụ ha na Chineke, Mosa. 3:19 ; 5:2–7 .
A ga-amụrịrị mmadụ nile ọzọ, e, mụọ ha site na Chineke, Mosa. 27:25–26 (Alma 5:49 ).
Unu abụrụwo ndị a mụrụ site na mụọ nke Chineke? Alma 5:12–19 .
Ọbụrụ na-amụghị unu ọzọ unu enweghị ike iketa ala-eze elu-igwe, Alma 7:14 .