Zuru-oke Izu-ezu, nile, itozu etozu, ijupụta n’ezi-omume. Izu-oke nwekwara ike ịbụ e nweghị mmehie. Nanị Kraịst bụụrụ onye jupụtara n’izu oke. Ndị nsiso nke Kraịst n’ezi okwu nwere ike ghọọ ndị zuru oke site n’amara na aja mgbaghara mmehie ya. Ka obi unu zukwa oke n’ebe Onye-nwe nọ, 1 Ndez. 8:61. Ya mere unu zuo oke dịka Nna unu nke elu-igwe, Mat. 5:48 (3 Nif. 12:48). Ọ bụrụ na onye ọbụla asụghị ngọngọ n’okwu, onye ahụ bụ nwoke tozuru-oke, Jemes 3:2. Okwukwe abụghị inwe mmata zuru-oke nke ihe nile, Alma 32:21, 26. A chụrụ aja mgbaghara mmehie ka Chineke wee bụrụ Chineke zuru-oke, Alma 42:15. Moronaị bụụrụ nwoke nke nwere nghọta zuru oke, Alma 48:11–13, 17–18. Mụọ nke Kraịst ka e nyere mmadụ nile, ka ha wee kpee ikpe ma mata jiri ọmụma-ihe zuru oke mata ma ihe ọbụ nke Chineke ma-ọbụ nke ekwensu, Moro. 7:15–17. Bịakwute nụ Kraịst, ma ka e mee ka unu zuo-oke n’ime ya, Moro. 10:32. Gaa nụ n’iru na ndidi ruo mgbe unu zuru-oke, OznỌd. 67:13. Ndị a bụ ndị ezi-omume ndị e meworo ka ha zuo-oke site na Jisus, OznỌd. 76:69. Ọkwa-ọrụ nile dị na Nzukọ-nsọ bụ maka izu-oke nke Ndị-nsọ, OznỌd. 124:143 (Ndị-Efe. 4:11–13). Ndị dị ndụ enweghị ike itozu-oke ma ndị ha nwụrụ anwụ anọghị ya, OznỌd. 128:15, 18. Noa bụụrụ onye ezi-omume, zuo kwa oke n’ọgbọ nke ya, Moses 8:27.