Oge Jisus g’abia n’ụwa chia otu puku afọ Hụ kwa Ala-mụọ; Ọbịbịa nke ugboro abụọ nke Jisus Kraịst Oge otu puku afọ nke udo nke ga-amalite mgbe Kraịst lọghachịri ịchị-eze n’onwe ya n’elu ụwa (Ndep. Ok 1:10). Ndị mmadụ a gaghị ebulite mma-agha, ọbụghị ma ha ga-amụta kwa agha ọzọ, Aịsa. 2:4 (2 Nif. 12:4; Maịka 4:3). Ala nke tọgbọọrọ n’efu a ghọwo ubi dịka Ogige-ubi Iden, Ezik. 36:35. Ha wee dị ndụ so kwa Kraịst chịa-eze otu puku afọ, Mkpu. 20:4. N’ihi ezi-omume, Setan enweghi ike ọbụla, 1 Nif. 22:26. Aga m ebiri n’ezi-omume n’elu ụwa ọtu puku afọ, OznỌd. 29:11. Mgbe puku afọ ahụ gasịrị a ga m arapụ ụwa nwa obere oge, OznỌd. 29:22. Nnukwu otu puku afọ ahụ Jisus ga-abịa n’ụwa chịa, ga-abịa, OznỌd. 43:30. Ụmụ nke ezi-omume ga-etopụta na-enweghị mmehie, OznỌd. 45:58. Ụmụ-ntakịrị ga-etolite ruo mgbe ha ga-aka nka; a ga-agbanwe ndị mmadụ n’otu ntabi-anya, OznỌd. 63:51. Na mmalite nke afọ nke puku asaa, Onye-nwe ga-edo ụwa nsọ, OznỌd. 77:12. Ha agaghị adị ndụ ọzọ ruo ọgwụgwụ nke otu puku afọ ahụ, OznỌd. 88:101. A ga-eke Setan agbụ ruo otu puku afọ, OznỌd. 88:110. Ụdị obibi ndụ n’oge Jisus ga-abịa n’ụwa chịa otu puku afọ ka a kọwara nke ọma, OznỌd. 101:23–34. Maka n’oghere nke otu puku áfọ̀ ka ụwa ga-ezu-ike, Moses 7:64.