Dị nwayọ, Ịdị nwayọ Hụ kwa Ndidi; Obi tiwara-etiwa; Umeala, Ịdị umeala Ịtu egwu Chineke, ezi-omume, umeala, ịnata nkuzi, na nwee ndidi n’okpuru ahụhụ. Ndị dị nwayọ dị na njikere iso nkuzi nile nke ozi-ọma. Moses dịịrị nwayọ n’obi nke ukwu, Ọnọgụ. 12:3. Ndị dị nwayọ n’obi ga-eketa ala, Abụọma 37:11 (Mat. 5:5; 3 Nif. 12:5; OznỌd. 88:17). Chọọnụ Onye-nwe, unu nile ndị dị nwayọ n’obi, chọọnụ ezi-omume, chọọ nụ ịdị nwayọ n’obi, Zef. 2:3 (1 Tim. 6:11). Mụta kwa nụ maka m n’ihi na abụ m onye dị nwayọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi, Mat. 11:29. Ịdị nwayọ bụ mkpụrụ nke Mụọ, Ndị-Gal. 5:22–23. Onye odibo nke Onye-nwe ga-adịrịrị nwayọ n’ebe mmadụ nile nọ, nwere kwa ike izi ihe, nwee ndidi, jiri ịdị nwayo na-adọ ndị na-edo onwe ha imegide ya aka na ntị, 2 Tim. 2:24–25. Mụọ nke dị nwayọ dịkwa n’udo, di oke ọnụ ahịa n’anya Chineke, 1 Pita 3:4. Wepu mmadụ nke ụdị okike ma ghọọ onye dị nwayọ, Mosa. 3:19 (Alma 13:27–28). Chineke nyere Hilaman iwu ka ọ kuziere ndị mmadụ ahụ ịdị nwayọ, Alma 37:33. Amara nke Onye-nwe zuru oke maka ndị dị nwayọ, Ita 12:26. Unu nwere okwukwe na Kraịst n’ihi ịdị nwayọ unu, Moro. 7:39. Ọ dịghi onye a na-anabata n’iru Chineke ma-ọbụghị na ọ dị nwayọ ma wedata obi ala, Moro. 7:44. Nsachapụ nke mmehie nile na-eweta ịdị nwayọ, ma n’ihi ịdị nwayọ ka nleta nke Mụọ Nsọ ga-esi wee bịa, Moro. 8:26. Jee ije n’ịdị nwayọ nke Mụọ m, OznỌd. 19:23. Chịa ụlọ gị na ịdị nwayọ, OznỌd. 31:9. Ike na ike na-arụ ọrụ n’ime ọkwa nchụ-aja ka e nwere ike ikwado site na ịdị umeala na ịdị nwayọ, OznỌd. 121:41.