Ihe iriba-ama nile nke ọmụmụ na ọnwụ nke Jisus Kraịst Hụ kwa Jisus Kraịst Ihe omume nile soro ọmụmụ na ọnwụ Jisus Kraịst. Ọmụmụ Nwa-agbọghọ na-amaghị nwoke gaje ịdị ime ọ gajekwa ịmụ nwa-nwoke, Aịsa. 7:14. N’ime Betlehem ka otu onye ga-esi pụta ịbụ onye na-achị achị n’Israel, Maịka 5:2. Samuel Onye Leman ahụ wee buo-amụma otu ụbọchị, otu abalị, na otu ụbọchị nke ìhè, otu kpakpando ọhụrụ, na ihe iriba-ama ndị ọzọ, Hil. 14:2–6. Ihe iriba-ama nile ahụ ka e mezuru, 3 Nif. 1:15–21. Ọnwụ Samuel onye Leman buru-amụma ọchịchịrị, ịgba egbe elu-igwe nile na igbu amụma nile, na ịma jijiji nke ụwa, Hil. 14:20–27. Ihe iriba ama ahụ nile ka e mezuru, 3 Nif. 8:5–23.