Ọ́hụ̀ Mbụ
Mpụta ìhè ahụ nke Chineke Nna ahụ na Ọkpara ya Jisus Kraịst pụtara gosi onwe ha nye Onye-amụma Joseph Smith n’ime oghere ọgba osisi nile.
Na mmalite udu mmiri nke afọ 1820, Joseph Smith nta nọdụrụ n’afọ nke iri na ise ya. O biiri, ya na ezi na ụlọ ya n’obodo mepere-emepe nke Palmyra, New York. Na mkpirisi ohere dị na mpaghara ọdịda anyanwụ nke ebe obibi nke ezi na ụlọ ahụ ka oghere-ọgba nnukwu osisi nile dị. Joseph wee gaa n’ebe a ikpe ekpere nye Chineke, ịmara nzukọ-nsọ nke ziri ezi. O nweworị nkwagide mgbe ọ gụrụ Bible na ọ ga-achọrịrị ọzịza ahụ site n’aka Chineke (Jemes 1:5–6). N’ọzịza nke ekpere ya, Nna na Ọkpara ahụ pụtara ihe gosi ya onwe ha na gwa ya ka ọ ghara isonye na nke ọbụla n’ime nzukọ-nsọ nile ahụ dị n’elu ụwa mgbe ahụ, n’ihi na ha nile e zighị-ezi (A—JS 1:15–20). Uche e nwetara site n’ihe nke a dị nsọ mere eme malitere usoro ihe omume nile nke ga-eweta mweghachi nke ozi-ọma na ezi Nzukọ-nsọ nke Kraịst.