Ọnọdụ nke nnukwu anụrị na-abịa site na-ibi ndụ ezi-omume. Isi ihe eji a dị ndụ nke na-anwụ anwụ bụ ka mmadụ nile nwee ọn̄ụ (2 Nif. 2:22–25 ). Uju nke ọn̄ụ na-abịa site na Jisus Kraịst (Jọn 15:11 ; OznỌd. 93:33–34 ; 101:36 ).
Ana m ezi unu ozi nile nke oke on̄u, Luk 2:10 .
Ọdighị kwa onye ọbụla ga-anara unu on̄u unu, Jọn 16:22 .
Mkpụrụ nke Mụọ bụ ịhụnanya, on̄u, udo, Ndị-Gal. 5:22 .
Mkpụrụ osisi ahụ mejupụtara mụọ m n’oke on̄u, 1 Nif. 8:12 .
Mmadụ dị ka ha wee nwee on̄u, 2 Nif. 2:25 .
On̄u ndị ezi-omume ga-eju eju ruo mgbe nile, 2 Nif. 9:18 .
Ha na Chineke ga-ebi n’ọnọdụ an̄ụrị na-enweghi ọgwụgwụ, Mosa. 2:41 .
Aga m enyepụ ihe nile nke m nwere, ka m wee nweta nnukwu on̄u nke a, Alma 22:15 .
Eleghị anya, aga m abụ ngwa-ọrụ n’aka nile nke Chineke iweta ụfọdụ mkpụrụ obi na nchegharị; ma nke a bụ on̄u m, Alma 29:9 .
Olee on̄u, ma o lee ìhè di ịtụ n’anya m hụrụ, Alma 36:20 .
Mụọ m ga-emeju mkpụrụ-obi gị n’on̄u, OznỌd. 11:13 .
Olee otu ịdị ukwuu nke on̄u gị na ya ga-adị n’ala-eze nke Nna m, OznỌd. 18:15–16 .
N’ime ụwa nke a on̄u unu e zughị oke ma n’ime m on̄u unu zuru oke, OznỌd. 101:36 .