Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Jemes, Nwa-nwoke nke Zebedi


Jemes, Nwa-nwoke nke Zebedi

Otu n’ime Ndị-Ozi Iri na Abụọ Jisus họọrọ n’oge ije-ozị ya n’arụ na-anwụ anwụ. Ọ bụụrụ nwa-nne nwoke nke Jọn. Ọ bụụrụ otu n’ime Ndị-ozi atọ a họọrọ ịnọ ha na Jisus n’oge ụfọdụ nile pụrụ iche: na nkulite nke nwa-nta nwanyị nwa Jairos (Mak 5:37), na mnwogharị ahụ (Mat. 17:1; Mak 9:2; Luk 9:28), ma na Getsamane (Mat. 26:37; Mak 14:33). Tinyere Pịta na Jọn, o weghachiri Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek n’ụwa site na-ichi Joseph Smith echichi (OznỌd. 27:12; 128:20; A—JS 1:72).

Bipụta