Mmekọrịta nwoke na nwanyị na-enweghị nkwado nke iwu dị n’etiti mmadụ abụọ na-alụrịtaghị di na nwunye. N’ime akwụkwọ nsọ nile a na-eji ya kwa-mgbe-kwa mgbe dịka akara maka ngọnarị okwukwe.
Hapụ ịkwa-iko dị n’etiti ndị na-alughị alụlụ, Ọlndoz. 15:20 .
Arụ anyị a dịghịrị ịkwa-iko dị n’etiti ndị na-alughị alụlụ, kama ọ dịịrị Onye-nwe, 1 Ndị-Kọ 6:13–18 .
Iji gbanarị ịkwa-iko dị n’etiti ndị na-alughị alụlụ, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, 1 Ndị-Kọ 7:2–3 .
Nke a bụ ihe Chineke na-achọ, ka unu ghara ịkwa-iko dị n’etiti ndị na-alughị alụlụ, 1 Ndị-Tes. 4:3 .
Jekọb wee dọọ ndị Nifaị aka na ntị megide ịkwa-iko dị n’etiti ndị na-alughị alụlụ, Jekọb 3:12 .
Unu na-acha, n’ihi igbu mmadụ unu nile, na ịkwa-iko dị n’etiti ndị na-alughị alụlụ maka mbibi, Hil. 8:26 .