Onye-nnapụta Hụ kwa Jisus Kraịst Jisus Kraịst bụ Onye-nnapụta nke mmadụ n’ihi na ọ na-azọpụta mmadụ nile site n’ịbụ oru nke ọnwụ, na ndị na-echegharị site na-ọpịpịa nile dịịrị mmehie. Onye-nwe bụ oke nkume m na onye-nnapụta m, 2 Sam. 22:2 (Abụọma 18:2; 144:2). Gị onwe gị bụ onye inye-aka m na onye-nnapụta m, Abụọma 40:17 (Abụọma 70:5). Onye-nnapụta ahụ ga-esi na Zaiọn pụta, Ndị-Rom 11:26. Ndị nsọ nile nakweere Ọkpara Chineke dịka Onye-mgbapụta na Onye-nnapụta ha, OznỌd. 138:23.