Nlekọta ndị nriria Hụ kwa Gwọọ, Ọgwụgwọ nile; Ibịkwasị aka nile n’elu; Ite mmanụ; Mmanụ; Ọkwa nchụ-aja Ngọzi a n’enye ndị ahụ na-adịghị ike site n’aka ndị ji Ọkwa Nchụ-aja nke Melkizedek site na-iji mmanụ e doro nsọ. Bikwasa ya aka gị, Mat. 9:18. Jisus wee bikwasa ndị nrịrịa ole na ole aka ya nile ma gwọọ ha, Mak 6:5. Ndị-Ozi Kraịst tere ọtụtụ ndị ọrịa mmanụ ma gwọọ ha, Mak 6:13. Ndị Okenye ga-ete ndị nrịrịa mmanụ ma gwọọ ha, Jemes 5:14–15. Unu agaghị agwọ ndị nrịrịa ewezuga ma ha chọrọ otua n’aka unu site na ndị chọrọ ya, OznỌd. 24:13–14. Ndị okenye ga-ebikwasa ndị nrịrịa aka ha nile, OznỌd. 42:44. Bịakwasị ndị nriria aka gị nile ma arụ ga-adi ha ike, OznỌd. 66:9.