Ndị Antai-Nifaị-Lihaị Hụ kwa Amọn, nwa-nwoke nke Mosaịa; Ụmụ ndịkom nke Hilaman; Ụmụ ndịkom nke Mosaịa N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, aha e nyere ndị Leman ndị ụmụ ndịkom nke Mosaịa gbanwere. Mgbe a gbanwesịrị ha, ndị a akpọkwara ndị nke Amọn, kwesịrị ntụkwasị obi n’ime ndụ ha nile (Alma 23:4–7, 16–17; 27:20–27). Ha wee kpọkwasị onwe ha aha ndị Antai-Nifaị-Lihaị, Alma 23:16–17; 24:1. Ha jụrụ ikwafu ọbara ma lie ngwa-ọgụ ha nile n’ala, Alma 24:6–19. Ụmụ ha ndịkom mere nkwadobe maka agha ma ha chọrọ ka Hilaman bụrụ onye-ndu ha, Alma 53:16–19; 56–58 (Umu ndịkom ndị a ka a maakwara dika Ụmụ okoro ọbịa ndị agha dị Puku abụọ).