Nnyefe kpam-kpam nke ịhụnanya miri-emi. Ịhụnanya maka Chineke sonyere inyefe kpam-kpam, ife ofufe, nsọpụrụ, ịdị-nro, ebere, mgbaghara, ọmiko, amara, ofufe; afọ-ojuju, ọbi-ọma. Ima-atụ nke kachasị ukwuu nke ịhụnanya Chineke maka ụmụ ya ka a chọtara n’ime aja mgbaghara mmehie na-enweghị oke nke Jisus Kraịst.
Chineke hụrụ ụwa n’anya na O nyere Ọkpara Ọ Mụrụ Nanị Ya, Jọn 3:16 (OznỌd. 138:3 ).
Ka unu hụrịta ibe unu n’anya, dịka M hụrụ unu n’anya, Jọn 13:34 (Jọn 15:12, 17 ; Moses 7:33 ).
Ọbụrụ na unu na-ahụ m n’anya, unu ga-edobe iwu-nsọ m nile, Jọn 14:15 (OznỌd. 42:29 ).
Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a ukwuu, na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya n’ihi ndị-enyi ya, Jọn 15:13 .
Pịta, i hụrụ m n’anya karịa ndị a? Na-enye atụrụ m nri, Jọn 21:15–17 .
Ọ dịghị ihe ọbụla pụrụ ikewapụ anyị site n’ịhụnanya Chineke nke dị n’ime Kraịst, Ndị-Rom 8:35–39 .
Ihe anya na-ahụghi bụ ihe nile nke Chineke kwadobeere ha bụ ndị hụrụ ya n’anya, 1 Ndị-Kọ 2:9 .
Were nụ ịhụnanya bụrịtanụ oru ibe unu, Ndị-Gal. 5:13 .
Ndị bụ di na-ahụnụ nwunye unu n’anya, Ndị-Efe. 5:25 (Ndị-Kọl. 3:19 ).
Unu ahụla ụwa n’anya, 1 Jọn 2:15 .
Chineke bụ ịhụnanya, 1 Jọn 4:8 .
Anyị na-ahụ ya n’anya, n’ihi na ya Onwe ya buru ụzọ hụ anyị n’anya, 1 Jọn 4:19 .
Kraịst ga-ata ahụhụ n’ihi obi-ebere ịhụnanya ya n’ebe ndị mmadụ nọ, 1 Nif. 19:9 .
Unu ga na-aga n’iru n’ịhụnanya nke Chineke na nke mmadụ nile, 2 Nif. 31:20 .
Unu ga-akụziri ụmụ unu ịhụrịta onwe ha n’anya na ijerịtara onwe ha ozi, Mosa. 4:15 .
Ọbụrụ na unu enwewo mmetụ ịbụ abụ mgbapụta ịhụnanya, unu nwere ike inwe mmetụ dị otu ahụ ugbua? Alma 5:26 .
Ka Mụọ Nsọ na-edu unu ịghọ ndị na-enwe ndidi, jupụta n’ịhụnanya, Alma 13:28 .
Jikọta onwe gị n’ihe nile metụtasịrị gị ike, ka i wee jupụta n’ịhụnanya, Alma 38:12 .
E nweghị ndọrọ-ndọrọ n’ihi ịhụnanya nke Chineke nke bi n’ime obi nile nke ndị ahụ, 4 Nif. 1:15 .
Ihe nile nke na-akpọ oku ịhụ Chineke n’anya bụ Chineke kwalitere ya, Moro. 7:13–16 .
Afọ-ọma bụ ịhụnanya nke Kraịst na-enweghị ntụpọ, Moro. 7:47 .
Ịhụnanya zuru-oke na-achụpụ egwu, Moro. 8:16 (1 Jọn 4:18 ).
Ịhụnanya na-eme ka mmadụ tozuo oke ịrụ ọrụ Chineke, OznỌd. 4:5 (OznỌd. 12:8 ).
Nsacha na-abịara ndị nile ahụ bụ ndị hụrụ Chineke n’anya ma na-ejekwara ya ozi, OznỌd. 20:31 .
Ọbụrụ na unu hụrụ m n’anya, unu ga-ejere m ozi ma dobe iwu-nsọ m nile, OznỌd. 42:29 (Jọn 14:15 ).
Gosipụta mbawanye nke ịhụnanya nye ndị ahụ nke ị tara-ụta, OznỌd. 121:43 .