Mbuli-elu Hụ kwa Aja mgbaghara mmehie, Ịchụ aja mgbaghara mmehie; Ebube Selestịal; Ndụ ebigh-ebi; Nwoke, ndị nwoke—Mmadụ, nwere ike ịdị ka Nna nke Elu-igwe; Okpu-eze Ọnọdụ an̄ụrị kachasị elu na ebube n’ime ala-eze Selestịal. N’iru gị ka uju nke on̄u dị, Abụọma 16:11. Ha bụ chi nile, ọbụna ụmụ ndịkom nile nke Chineke—Ya mere, ihe nile bụ nke ha, OznỌd. 76:58–59. Ndị-nsọ nile ga-anata ihe nketa ma a ga-eme ha iha-otu ya na ha, OznỌd. 88:107. Ndị mụọ-ozi ndị a edebeghị iwu nke m; ya mere, ha ga-anọrọ onwe ha n’otu n’otu; na-enweghi mbuli-elu, OznỌd. 132:17. Ndị nwoke na ndị nwanyị ga-alụrịrị ọlụlụ di na nwunye dịka iwu Chineke siri dị iji nọrọ n’usoro inweta mbuli-elu, OznỌd. 132:19–20. Wara wara ka ọnụ-ụzọ ama ahụ dị ma mkpafa ka ụzọ ahụ dịkwa nke na-eduba na mbuli-elu, OznỌd. 132:22–23. Abraham, Aịsak na Jekọb abanyewori n’ime mbuli-elu ha, OznỌd. 132:29, 37. Ana m arachi n’isi gị mbuli-elu gị, OznỌd. 132:49.