Nsọpụrụ Hụ kwa Egwu, Ịtụ-egwu; Nnukwu-ugwu Nkwanye ugwu miri emi maka ihe nile dị nsọ; ihe ebube. Onye-nwe nyere Moses iwu ka o yipụ akpụkpọ-ụkwụ ya nile, n’ihi na ya onwe ya na-eguzo n’ala nsọ, Ọpụ. 3:4–5. Chineke ka a ga-atụ egwu nwekwara ya na nsọpụrụ, Abụọma 89:7. Were nsọpụrụ na itụ egwu Chineke fee Chineke ofufe a ga-anabata, Ndị-Hib. 12:28. Moronaị kpọrọ isi n’ala ma kpesie ekpere ike, Alma 46:13. Igwe mmadụ ahụ dara n’ala ma fee Kraịst ofufe, 3 Nif. 11:12–19. Kpọọ isi-ala n’iru m, OznỌd. 5:24. N’iru oche-eze Chineke ihe nile na-akpọ isi ala na nsọpụrụ umeala, OznỌd. 76:93. Uche unu nile agbawo ọchịchịrị n’ihi na unu ewerewo ka ihe dị mfe ihe nile nke unu nataworo, OznỌd. 84:54–57. Ikpere ọbụla ga-egburu, ma ire ọbụla ga-ekwupụta, OznỌd. 88:104. Site na nkwanye ugwu ma-ọbụ nsọpụrụ nye aha nke Onye-Kachasị-Elu, Nzukọ-nsọ kpọrọ ọkwa nchụ-aja ahụ aha Melkizedek, OznỌd. 107:4. Ngọzi nile ka a ga-awụsa n’elu ndị ahụ ndị ga-asọpụrụ Onye-nwe n’ime ụlọ ya, OznỌd. 109:21.