Jared Hụ kwa Jared, Nwanne-nwoke nke; Ndị Jared Otu onye-ndu nke Akwụkwọ nke Mọmọn onye, tinyere nwanne ya nwoke, duru ndị mmadụ si na ụlọ-elu nke Tọwa Bebel gaa na ala e kwere na nkwa dị na ọkara okirikiri mpaghara ọdịda-anyanwụ nke ụwa (Ita 1:33–2:1). Jared gwara nwanne ya nwoke ka o kpee ekpere ka Onye-nwe ghara ịgwakọta asụsụ ezi na ulo ha na nke ndị enyi ha nile, Ita 1:34–37. Ha jere njem gaa n’oke osimiri ma bie ebe ahụ afọ anọ, Ita 2:13. Nyara ụgbọ mmiri gaa n’ala ekwere na nkwa, Ita 6:4–12.