Efu, Ihe-efu Hụ kwa Ịdabere n’ihe nke ụwa; Mpako Abụghị ezi-okwu ma-ọbụ nduhie; mpako, efu na ihe-efu nwekwara ike ipụta ighere-oghe ma-ọbụ enweghị afọ-ojuju. Onye ahụ na ebulịghị mkpụrụ-obi ya nye ihe-efu ga-eguzo n’ebe nsọ nke Onye-nwe, Abụọma 24:3–4. Mgbe anyị na-ekpe ekpere anyị ekwula okwu nkwukwasị efu, Mat. 6:7. Nnukwu na obosara ụlọ ahụ bụ echiche nke efu nile na mpako, 1 Nif. 12:18. Unu ga-anọsirịrị ike n’itinye obi unu nile n’ihe efu nile nke ụwa? Alma 5:53. A chọsokwala ihe efu nile nke ụwa nke a; n’ihi na ị gaghị eburu ha nye onwe gị, Alma 39:14. Ihe-efu na ekweghị ekwe e wetawo Nzukọ-nsọ n’okpuru amamikpe, OznỌd. 84:54–55. Mgbe anyị na-agbalị imeta ọchịchọ nke ihe-efu anyị mma, elu-igwe nile ewezuga onwe ha, OznỌd. 121:37.