Inwe mmetụta, Nke mmetụta Hụ kwa Adịghị-ọcha mmekọrịta; Ịdị-ọcha mmekọrịta; Ịkwa-iko; Ịkwa-iko dị n’etiti ndị n’alụghị alụ; Ọchịchọ nke anụ-arụ Inwe mmasị ma-ọbụ agụụ maka ajọọ-omume ihe-ụtọ nke arụ nke ka nke adịghị-ọcha mmekọrịta. Nwunye nke nna-ukwu ya weliri anya ya abụọ lekwasị Josef, Jen. 39:7. Onye ọbụla lekwasịrị nwanyị anya, inweso ya agụụ ọchịchọ nke anụ arụ, akwaworị iko, Mat. 5:28 (3 Nif. 12:28). Ghara nụ agụụ ọchịchọ nke anụ arụ nile, nke bụ ihe na-ebu agha imegide mkpụrụ-obi, 1 Pita 2:11. Agụụ ọchịchọ nke anụ arụ na agụụ ìme ihe ọjọọ nke anya nile, esiteghị na Nna ahụ, 1 Jọn 2:16. Kwụsị ịgaso ọchịchọ nile nke anụ arụ nke anya gị abụọ, Alma 39:9. Site na njehie nke iwu ndị a dị nsọ mmadụ bịara nwee mmetụta, OznỌd. 20:20. Ọbụrụ na onye ọbụla akwaa iko n’obi ya, ha agaghị enwe mụọ ahụ, OznỌd. 63:16. Kwụsị site n’agụụ ọchịchọ nile nke anụ arụ, OznỌd. 88:121. Ndị mmadụ malitere ịbụ nke anụ arụ, inwe mmetụta, ndị na-eso ekwensu, Moses 5:13 (Mosa. 16:3; Moses 6:49).