Họrọ, Họọrọ, Họrọworo (ngwaa) Hụ kwa Chineke Kpọrọ, Kpọọ-oku, Ọkpụkpọ-oku; Inwere-onwe, Nnwere-onwe; Ohere-ịhọrọ Mgbe Onye-nwe na-ahọrọ ma-ọbụ họọrọ otu mmadụ ma-ọbụ ndị otu, ọ na-akpọkaarị ha oku ife ofufe. Họpụtara nụ onwe unu taa onye unu ga-efe, Josh. 24:15 (Alma 30:8; Moses 6:33). Ahọpụtawo m gị n’oke ọkụ nke mkpagbu, Aịsa. 48:10 (1 Nif. 20:10). Ọbụghi unu họpụtara m kama mụ onwe m họpụtara unu, Jọn 15:16. Chineke a họpụtawo ihe nzuzu nke ụwa, ka o wee mee ka ihere mee ndị maara ihe, 1 Ndị-Kọ 1:27. Ọ họrọwo anyị tutu atọ ntọ-ala nke ụwa, Ndị-Efe. 1:4. Anyị nwere onwe anyị ihọrọ nnwere onwe na ndụ ebighi-ebi ma-ọbụ ndọkpụ n’agha na ọnwụ, 2 Nif. 2:27. Ndị a mara ama na ndị dị ukwuu nile ka a họworo site na mmalite, OznỌd. 138:55–56. Chineke họrọwororị Israel, Moses 1:26. A họrọwọrị Abraham tutu a mụọ ya, Abr. 3:23.