Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Elu-igwe


Elu-igwe

Asụsụ ahụ elu-igwe nwere ntọ-ala mpụtara abụọ n’ime akwụkwọ-nsọ nile. (1) Ọbụ ebe Chineke bi na ebe obibi ọdiniru nke ndị-nsọ nile (Jen. 28:12; Abụọma 11:4; Mat. 6:9). (2) Ọbụ mbara irukpu ahụ ndị ụwa gburu gburu (Jen. 1:1, 17; Ọpụ. 24:10). O doro anya na elu-igwe abụghị paradaịs, nke bụ ebe ichere oge maka mụọ nile kwesịrị ntụkwasị-obi nke ndị ahụ biri ndụ na nwụọ n’elu ụwa. Jisus letara paradaịs mgbe ọ nwụsịrị ọnwụ n’elu obe, mana ụbọchị nke atọ, ọ gwara Meri na ya a gabeghi na ebe Nna ahụ nọ (Luk 23:39–44; Jọn 20:17; OznỌd. 138:11–37).

Bipụta