N’ime Testament Ọhụrụ, otu nwagbọghọ na-amaghị nwoke nke Chineke Nna ahụ họọrọ ịbụ nne nke Ọkpara Ya n’anụ arụ. Mgbe a mụsịrị Jisus, Meri mụtara ụmụ ndị ọzọ (Mak 6:3 ).
Ekweere na Josef ga-alụ Meri, Mat. 1:18 (Luk 1:27 ).
A gwara Josef ka ọ ghara igbara ya alụghịkwa m ma-ọbụ tọhapụ ya site na nkwenye alụlụ ahụ, Mat. 1:18–25 .
Ndị nwoke ahụ maara ihe letara Meri, Mat. 2:11 .
Meri na Josef wee kụrụ nwa ọhụrụ Jisus gbalaga Ijipt, Mat. 2:13–14 .
Mgbe Herọd nwụsịrị ezi na ụlọ ahụ lọtakwara na Nazaret, Mat. 2:19–23 .
Mụọ-ozi Gebriel letara ya, Luk 1:26–38 .
O letara Elizabet, onye ikwu ya, Luk 1:36, 40–45 .
Meri wee bụọ abụ-ọma nke ịja-mma nye Onye-nwe, Luk 1:46–55 .
Meri na Josef wee gaa na Betlehem, Luk 2:4–5 .
Meri wee mụta Jisus ma nyibe ya n’ihe a na-etinye nri anụ-ụlọ, Luk 2:7 .
Ndị-ọzụzụ-atụrụ wee jee na Betlehem ileta Kraịst ahụ bụ nwa ọhụrụ, Luk 2:16–20 .
Meri na Josef wee kụrụ Jisus gaa na temple na Jerusalem, Luk 2:21–38 .
Meri na Josef wee kụrụ Jisus jee kwa Ememe Ngabiga, Luk 2:41–52 .
Meri nọkwaara na ọlụlụ nwunye ahụ na Kena, Jọn 2:2–5 .
Onye-nzọpụta ahụ, mgbe ọ nọọrọ n’elu obe gwara Jọn ka O lekọta nne ya, Jọn 19:25–27 .
Meri na Ndi-ozi nọgidere mgbe e welitesịrị Kraịst baa n’ime elu-igwe, Ọlndoz. 1:14 .
Meri bụụrụ nwa-agbọghọ na-amaghị nwoke, ọ mara mma karịa dị kwa ọcha karia ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị ọzọ, 1 Nif. 11:13–20 .
Nne nke Kraịst ka a ga-akpọ Meri, Mosa. 3:8 .
Meri ga-abụ nwa-agbọghọ na-amaghị nwoke, onye dị oke ọnụ ahịa na abọ a họpụtaworo, Alma 7:10 .