Nọgide Hụ kwa Ihe isi-ike; Ndidi; Nwaa, Ọnwụnwa Ịnọgide sie ike na mkpebi ịbụ ezie nye iwu-nsọ nke Chineke na-agbanyeghị ọnwụnwa, mmegide, na ihe isi-ike. Onye na-anọgide ruo n’ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta, Mat. 10:22 (Mak 13:13). Ha enweghị mgbọrọgwụ, ya mekwara ha na-anọgide nwa oge, Mak 4:17. Afọ-ọma na-anọgide n’ihe nile, 1 Ndị-Kọ 13:7. Mgbe Abraham jisiworo ndidi nọgide, o enweta nkwa ahụ, Ndị-Hib. 6:15. Ọbụrụ na ha anọgide ruo n’ọgwụgwụ a ga-ebuli ha elu n’ụbọchị ikpe-azụ, 1 Nif. 13:37. Ọ bụrụ na unu ga-erube isi n’iwu-nsọ nile ma nọgide ruo n’ọgwụgwụ a ga-azọpụta unu, 1 Nif. 22:31 (Alma 5:13). Ọbụrụ na unu ga-na-aga n’iru na-eri oriri n’elu okwu nke Kraịst ma nọgide ruo n’ọgwụgwụ, 2 Nif. 31:20 (3 Nif. 15:9; OznỌd. 14:7). Onye ọbụla nke wekwasịrị onwe ya aha m, ma nọgide ruo n’ọgwụgwụ a ga-azọpụta ya, 3 Nif. 27:6. Onye ọbụla nọgidekwara na Nzukọ-nsọ m ruo ọgwụgwụ, ya ka m ga-ehiwe n’elu oke nkume m, OznỌd. 10:69. Onye ahụ nke nọgidere n’okwukwe ya ga-emeri ụwa, OznỌd. 63:20, 47. Oche-eze nile na ọtụtụ ebe-ọchịchị ka a ga-eyikwasị n’elu ndị nile nọgidere na-ịdị ike maka ozi-ọma ahụ nke Jisus Kraịst, OznỌd. 121:29.