Esem-okwu, ịrụ-ụka, ọrụrụ-uka nile, Ndọrọ-ndọrọ nke ka nke, n’etiti ndị otu Nzukọ-nsọ nke Onye-nwe ma-ọbụ n’etiti ndị otu ezi na ụlọ, amasịghi Onye-nwe.
Ka esem-okwu ghara ịdị n’etiti mụ na gị, Jen. 13:8 .
Mpako na-akpata ndọrọ ndọrọ, Ilu 13:10 .
Asị na onye ọbụla nwere esem-okwu megide onye ọbula, ya gbaghara dịka Kraịst gbaghaworo, Ndị-Kọl. 3:13 .
N’eze nụ ajụjụ nzuzu nile na ndọrọ ndọrọ, Taịtọs 3:9 .
Onye-nwe na-enye ndị mmadụ iwu na ha-agaghị adọ ndọrọ ndọrọ, onye na ibe ya, 2 Nif. 26:32 .
Unu agaghị ekwe ụmụ unu ka ha lụwa ọgụ na sewe okwu otu na ibe ya, Mosa. 4:14 .
Alma nyere iwu na-agaghị enwe ndọrọ ndọrọ otu onye na ibe ya, Mosa. 18:21 .
Setan na-agbasa asiri nile na ndọrọ ndọrọ, Hil. 16:22 .
Ekwensu bụ nna nke ndọrọ ndọrọ ma na-akpalite ndị mmadụ ịdọ ndọrọ ndọrọ, otu onye na ibe ya, 3 Nif. 11:29 (Mosa. 23:15 ).