Obi Hụ kwa Amụrụ ọzọ, Amụrụ site na Chineke; Obi tiwara-etiwa Akara nke echiche na uche-obi nke mmadụ na isi mmalite mmetụta nke ime mụọ na nnyocha nile. Ịga-ewere obi gị nile hụ Onye-nwe Chineke gị n’anya, Deut. 6:5 (Deut. 6:3–7; Mat. 22:37; Luk 10:27; OznỌd. 59:5). Onye-nwe achọpụtaworo onwe ya nwoke dịka obi ya si chọọ, 1 Sam. 13:14. Mmadụ na-ele anya n’elu n’arụ, mana Onye-nwe na-ele obi, 1 Sam. 16:7. Onye nwere ọbụ-aka abụọ na obi na-enweghị ntụpọ ga-arigo n’ugwu nke Onye-nwe ma nata ngọzi, Abụọma 24:3–5 (2 Nif. 25:16). Dịka mmadụ si eche-echiche n’obi ya, otu a ka ọ dị, Ilu 23:7. Elaịja ga-eme ka obi ndị bụ nna chigharị kwụte ụmụ ha, ka obi ụmụ chigharikwutekwa ndị bụ nna ha, Mal. 4:5–6 (Luk 1:17; OznỌd. 2:2; 110:14–15; 138:47; A—JS 1:39). Ngọzi na-adịrị ndị dị ọcha n’obi, Mat. 5:8 (3 Nif. 12:8). Mmadụ na-esi n’ezi ihe ma-ọbụ ajọọ ihe nke obi ya na-ekwupụta okwu, Luk 6:45. Unu soro Ọkpara ahụ jiri nzube juru-eju nke obi, 2 Nif. 31:13. Unu abụrụwo ndị a mụrụ n’ime mụọ nke Chineke, ma unu enwetawo nnukwu mgbanwe n’obi unu nile? Alma 5:14. Unu ga-enye na-ichụrụ Onye-nwe aja obi tiwara etiwa na mụọ nke nchegharị, 3 Nif. 9:20 (3 Nif. 12:19; Ita 4:15; Moro. 6:2). Aga m agwa gị n’ime uche gị ma n’ime obi gị, site na Mụọ Nsọ, OznỌd. 8:2.