Kpee, Ikpe Hụ kwa Ikpe nke ikpe-azụ; Jisus Kraịst—Ikpe; Maa Ikpe, Ọmụma ikpe Ịchọpụta ka omume dị na mmetụta nke ụkpụrụ nile nke ozi-ọma; ikpebi; igosi ihe dị iche n’ihe-ọma site n’ihe-ọjọọ. Moses nọdụrụ ala ikpe ndị ahụ ikpe, Ọpụ. 18:13. N’ezi-omume ka ị ga-ekpe mmadụ ibe gị ikpe, Lev. 19:15. Unu e kpela ikpe ka a ghara ikpe unu ikpe, Mat. 7:1 (NAJS, Mat. 7:1–2; Luk 6:37; 3 Nif. 14:1). Ka ha ra bụ ndị mehiere n’okpuru iwu, a ga-esite n’iwu kpee ikpe, Ndị-Rom 2:12. Ndị-nsọ ga-ekpe ụwa ikpe, 1 Ndị-Kọ 6:2–3. Ọkpara Chineke nke mgbe nile na-adịgide ka ụwa kpere ikpe, 1 Nif. 11:32. Ndị-ozi Iri na Abụọ nke Nwa-atụrụ ahụ ga-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe, 1 Nif. 12:9 (OznỌd. 29:12). Ọnwụ, ala-mụọ, ekwensu ahụ, na ndị nile o jideworo n’ime ya a ga-ekperịrị ha ikpe, 2 Nif. 28:23 (1 Nif. 15:33). Ọbụrụ na unu kpee nwoke ahụ ikpe onye na-arịọ unu arịrịọ ka ọ ghara ịla n’iyi ma ma ya ikpe, olee ụdị nnukwu izi-ezi karịrị akarị amam-ikpe unu ga-adị maka ijighachi ihe onwunwe unu, Mosa. 4:22. A ga-ekpe ndị mmadụ ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị, Alma 41:3. Kpee ikpe n’ezi-omume, ị ga-enwe ikpe ziri-ezi e weghachiiri gị ọzọ, Alma 41:14. Site n’akwụkwọ nile nke a ga-ede ka a ga-esi kpee ụwa ikpe, 3 Nif. 27:23–26 (Mkpu. 20:12). Ndị fọdụrụ na ndị a ka a ga-ekpe ikpe site n’aka Iri na abụọ ahụ ndị nke Jisus họọrọ n’ala nke a, Mọm. 3:18–20. Mọmọn kọwara ụzọ a ga-esi kpee ikpe ihe-ọma site n’ihe ọjọọ, Moro. 7:14–18. Tinye ntụkwasị-obi gị na Mụọ ahụ nke na-eduba na-ikpe-ikpe ezi-omume, OznỌd. 11:12. Unu kwesịrị ikwu n’ime obi unu nile—ka Chineke kpee ikpe n’etiti mụ na gị, OznỌd. 64:11. Nzukọ-nsọ nke Onye-nwe ga-ekpe mba nile ikpe, OznỌd. 64:37–38. Ọkpara ahụ letara ndị mụọ nile nọ n’ụlọ mkpọrọ ka e wee kpee ha ikpe dịka ndị mmadụ n’anụ arụ, OznỌd. 76:73 (1 Pita 4:6). Onye ụkọchukwu ga-abụ onye-ikpe ọha na Israel, OznỌd. 107:72–74. Onye-nwe ga-ekpe mmadụ nile ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị, dịka ọchịchọ nke obị ha nile siri dị, OznỌd. 137:9.