Ozizi nile na ọrụ nile nke Nzukọ ahụ na-egosi na Chineke kwadoro ya ma bụrụ ụkpụrụ Onye-nwe hiwere maka ụmụ ya isi rita uru uju nke ngọzi ya nile. Ụfọdụ n’ime iriba-ama nile ahụ bụ ndị a na-eso:
Nghọta ziri-ezi nke Chukwu
Ụkpụrụ mbụ nile na emume nsọ nile
Ewezuga ma a mụrụ mmadụ ọzọ site na mmiri na Mụọ, Jọn 3:3–5 .
Chegharịa nụ ka e meekwa unu baptism, onye ọbụla n’ime unu n’aha Jisus Kraịst, Ọlndoz. 2:38 .
Mgbe ahụ ha ebịakwasị ha aka ha nile n’isi, ma ha wee nata Mụọ Nsọ, Ọlndoz. 8:14–17 .
Bia bụrụ ụmụ Chineke site n’okwukwe n’ime Jisus Kraịst, Ndị-Gal. 3:26–27 .
Ọkwa nchụ-aja kwesịrị-ekwesị dị mkpa iji mee baptism na inye onyinye nke Mụọ Nsọ, A—JS 1:70–72 .
Ụkpụrụ mbụ nile na emume-nsọ nile nke ozi-ọma ka a kọwara nke ọma, Ndep. Ok 1:4 .
Ebe ọ̀hụ́ na-adịghị ndị mmadụ na-ala n’iyi, Ilu 29:18 .
Onye-nwe na-ekpughe izu nzuzo ya nile nye ndị amụma ya, Emọs 3:7 .
Onye-amụma ga-anata Iwu-nsọ nile maka Nzukọ-nsọ, OznỌd. 21:4–5 .
Ọdịghi onye ga-ekwusa ozi-ọma ma-ọbụ wulite Nzukọ-nsọ elu ma ọ bụghị ma e chiri ya echichi site n’aka onye nwere ikike, OznỌd. 42:11 .
Ndị okenye nile ga-ekwusa ozi-ọma, na-ime omume si n’ikike, OznỌd. 68:8 .
Ntụkwasị akwụkwọ-nsọ nile gaje ịbịa
Ya mere gaa nụ, ma kuziere mba nile, Mat. 28:19–20 .
Iri mmadụ asaa ka a kpọrọ ka ha kwusaa ozi-ọma, Luk 10:1 .
Ndị okenye nile ga-apụ na-ezisa ozi-ọma, abụọ, abụọ, OznỌd. 42:6 .
A ga-ekwusarịri ozi-ọma nye ihe nile e kere-eke, OznỌd. 58:64 .
nke mụọ: Ha wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, Ọlndoz. 2:4 .
Ndị okenye ga-agwọ ndị nrịrịa, Jemes 5:14 .
Aga m eme ọgbụgba-ndụ ma ga-etinye ebe nsọ m n’etiti ha ruo-mgbe-nile, Ezik. 37:26–27 .
Onye-nwe ga-abịaru Temple ya na mberede, Mal. 3:1 .
Ndị-nsọ ka a tara ahụhụ n’ihi ha enweghị ike iwu ụlọ nke Onye-nwe, OznỌd. 95 (OznỌd. 88:119 ).
Ndị nke Onye-nwe na-ewu temple nile mgbe ọbụla maka ememe nke ndị ụka dị nsọ, OznỌd. 124:37–44 .
Iwu temple nile na-ịrụ ọrụ omenala nsọ nile bụ mpaghara nile nke oke ọrụ ụbọchị-ikpeazụ, OznỌd. 138:53–54 .