Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Jọn, Nwa-nwoke nke Zebedi


Jọn, Nwa-nwoke nke Zebedi

Otu n’ime Ndị-ozi Iri na Abụọ n’ime Testament Ọhụrụ, otu nwa-nwoke nke Zebedi, na otu nwanne nwoke nke Jemes. Na mbido ndụ ya ọ bụụrụ onye ọkụ-azụ (Mak1:17–20). Eleghị anya ọbụ ya bụ onye na-eso ụzọ Jọn ome baptism na-akpọghị aha nke a kpọtụrụ na Jọn 1:40. N’ikpe-azụ ọ natara ọkpụkpọ oku ịbụ onye na-eso ụzọ nke Jisus Kraịst (Mat. 4:21–22; Luk 5:1–11). O dere Ozi-ọma Jọn, akwụkwọ ozi atọ na akwụkwọ nke Mkpughe. Ọ bụụrụ otu n’ime mmadụ atọ ndị ha na Onye-nwe nọọrọ na mkpọlite nwa-ada-nwanyị Jairọs (Mak 5:35–42), n’ugwu nke mnwogharị (Mat. 17:1–9), na n’ime Getsemane (Mat. 26:36–46). Na-edemede nke ya ọ tụnyere onwe ya dịka onye na-eso ụzọ ahụ nke Jisus hụrụ n’anya (Jọn 13:23; 21:20) na dịka “onye na-eso ụzọ nke ọzọ ahụ” (Jọn 20:2–8). Jisus kpọkwara ya na nwanne ya nwoke Boanajis, “Ụmụ ọkpara nke egbe-elu-igwe” (Mak 3:17). E nwere ntụnye ọtụtụ mgbe nye ya na nkọwasi nke ikpọgide n’obe na mbilite n’ọnwụ (Luk 22:8; Jọn 18:15; 19:26–27; 20:2–8; 21:1–2). E mesịrị chụpụ Jọn n’ikpe-azụ gaa na Patmọs ebe o dere akwụkwọ nke Mkpughe (Mkpu. 1:9).

A kpọtụrụ Jọn ọnụ ọtụtụ mgbe na mkpughe ụbọchị ikpeazụ (1 Nif. 14:18–27; 3 Nif. 28:6; Ita 4:16; OznỌd. 7; 27:12; 61:14; 77; 88:141). Ebe ihe-ọgụgụ ndị a na-emesi akụkọ ndekọta nke Jọn na Bible ike ma na-enye nleba-anya n’ime ịdị ukwuu ya na ịdị mkpa nke ọrụ ahụ Onye-nwe nyeworo ya ka ọ rụọ n’elu ụwa n’oge nile nke Testament Ọhụrụ na n’ụbọchị ndị ikpe-azụ. Akwụkwọ-nsọ nile ụbọchị ikpe-azụ mere ka o doo anya na Jọn a nwụghị anwụ mana Onye-nwe kwenyere ka ọ fọdụ n’ụwa dịka nwa-odibo nkwusa-ozi ọma ruo oge ọbịbịa nke ugboro abụọ (Jọn 21:20–23; 3 Nif. 28:6–7; OznỌd. 7).

Akwụkwọ-ozi nile nke Jọn

Na-agbanyeghị na onye dere akwụkwọ-ozi atọ ndị a akpọtụghị onwe ya aha, asụsụ ya yiri nke ahụ bụ nke Jọn Onye-ozi nke mere na e weere na ọ bụ ya dere ha atọ.

1 Jọn 1 na-adọ ndị-nsọ nile aka na ntị ka ha na-erita uru ime Chineke enyi. Isi nke 2 na-ekwusi-ike na ndị-nsọ na-amara Chineke site na nrube-isi ma na-atụziri ha aka ka ha ghara ịhụ ụwa n’anya. Isi nke 3 na-akpọ mmadụ nile ka ha bịa-bụrụ ụmụ nke Chineke na ka ha na-ahụrịta onye ọbụla na ibe ya n’anya. Isi nke 4 na-akọwa na Chineke bụ ịhụn’anya ma na-ebi n’ime ndị ahụ bụ ndị na-ahụ ya n’anya. Isi nke 5 na-akọwa na Ndị-nsọ ka a mụrụ site na Chineke site n’ikwenye na Kraịst.

2 Jọn dị kwa ka 1 Jọn. N’ime ya Jọn n̄ụrịrị on̄u n’ihi ikwesị ntụkwasị obi nke ụmụ nke “nwanyị a họpụtaworo.”

3 Jọn na-eto onye a na-akpọ Gaiọs n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ya na inyere ndị ahụ hụrụ ezi-okwu n’anya aka.

Ozi-ọma nke Jọn

N’ime akwụkwọ Testament Ọhụrụ nke a, Jọn Onye-ozi ahụ gbara-ama na (1) Jisus bụ Kraịst ahụ ma-ọbụ Mesaia, na (2) Jisus bụ Ọkpara Chineke ahụ (Jọn 20:31). Ihe ilere anya nile sitere na ndụ Jisus nke ọ kọwara ka o doo anya ka a kpachara anya họrọ na doo n’usoro, buru ihe nke a n’uche. Akwụkwọ ahụ malitere jiri okwu banyere ọkwa Kraịst n’ime ndụ a dị tutu e nwee anụ arụ: Ya na Chineke nọọrọ, ọ bụụrụ Chineke, na ọ bụụrụ onye kere ihe nile. A mụrụ ya n’anụ arụ dịka Ọkpara ahụ Nna Mụrụ Nanị Ya. Jọn chusoro ụzọ ije-ozị nke Jisus, na-ekwusị ike ebe ọdị ukwuu ịdị nsọ ya na mbilite n’ọnwụ ya site na ndị nwụrụ-anwụ. O kwusịrị ya ike ebe o doro anya na Jisus bụ Ọkpara nke Chineke, nke ọrụ ebube nile gbara ama ya, ndị aka-ebe nile, ndị amụma nile na site n’ọlu okwu nke Kraịst n’onwe ya. Jọn na-akụzi site na-itule ìhè na ọchịchịrị, ezi-okwu na ihìe-ụzọ, ihe ọma na ihe ọjọọ, Chineke na ekwensu. Ikekwe e nweghị akụkọ ndekọta ọzọ e kwupụtara ịdị nsọ nke Jisus na e nweghị okwukwe nke ndị ọchịchị ndị Juu n’ụzọ doro anya.

Jọn dere karichaa banyere ije-ozị Kraịst na Judea, nke ka nke n’izu ụka ikpe-azụ nke ije-ozị ya n’arụ na-anwụ anwụ, ebe kwanụ Matiu, Mak, na Luk dere karịchaa banyere ije-ozị ya na Galili. Ọtụtụ ihe nile sitere n’ozi-ọma a ka a kọwaworo ka o doo anya na mkpughe ụbọchị ikpeazụ (OznỌd. 7 na OznỌd. 88:138–141).

Maka usoro mkpọkọta nke isi, hụ Ozi-ọma nile.

Akwụkwọ nke Mkpughe

Hụ Mkpughe nke Jọn

Bipụta