Osisi Olive Hụ kwa Israel; Mmanụ Otu osisi zuru ọnụ nye Israel na otu isi nnweta nke ọrụ ugbo dị mkpa n’ala nile nke Bible. A na-ákọ́ ya maka osisi ya, mkpụrụ, na mmanụ ya. Osisi Olive ka a na-ejikarịchasị n’ime akwụkwọ nsọ nile ịbụ akara nke ụlọ nke Israel. Ụlọ nke Israel ka a ga-atụnyere Osisi Olive nke alaka ya nile a gbajipụrụ ma fesasịa, 1 Nif. 10:12 (1 Nif. 15:12). Onye-nwe wee were ụlọ nke Israel tụnyere osisi olive nke ụlọ, Jekọb 5–6. Joseph Smith kpọrọ mkpughe dị na nkeji 88 akwụkwọ olive ahụ, OznỌd. 88:isi mmalite. Otu ọgaranya nwoke sịrị ndị odibo ya ka ha gaa n’ubi vine ya, ma kụọ osisi olive iri na abụọ, OznỌd. 101:43–62.