Jọn ome baptism Hụ kwa Elaias; Ọkwa nchụ-aja nke Erọn Nwa-nwoke nke Zakaraịa na Elizabet n’ime Testament Ọhụrụ. E zigara Jọn ka ọ kwadobe ndị mmadụ ka ha nabata Mesaia ahụ (Jọn 1:19–27). O jiiri ọtụghe-ụzọ nile nke Ọkwa Nchu-aja Erọn na mekwara Jisus Kraịst baptism. Aịsaịa na ndị ọzọ buru amụma banyere ije-ozị Jọn, Aịsa. 40:3 (Mal. 3:1; 1 Nif. 10:7–10; 2 Nif. 31:4). E tinyere Jọn n’ụlọ mkpọrọ ma bepụ ya isi, Mat. 14:3–12 (Mak 6:17–29). Gebriel kwupụtara ọmụmụ Jọn na ije-ozị ya nye Zakaraịa, Luk 1:5–25. Jisus kuziri na Jọn ome baptism bụụrụ nnukwu onye-amụma, Luk 7:24–28. O matara maka Jisus dịka Ọkpara nke Chineke, Jọn 1:29–34. Ndị na-eso ụzọ Jọn abịa bụrụ ndị na-eso ụzọ Jisus, Jọn 1:25–29, 35–42 (Ọlndoz. 1:21–22). Jọn arụghị ọrụ ebube, Jọn 10:41. Dịka onye biliworo n’ọnwụ, e zitere ya ichi Joseph Smith na Oliver Cowdery echichi n’Ọkwa Nchụ-aja nke Erọn, OznỌd. 13 (OznỌd. 27:7–8; A—JS 1:68–72). Onye mụọ-ozi chiri ya echichi mgbe ọ dị abalị asatọ, OznỌd. 84:28.