Chineke na-enye mmadụ ọtụtụ ngọzi na onyinye nile.
Otu onyinye a na-enye Onye-nwe. Testament Ochie jiri okwu ahụ na-atụnyere ịchụ-aja nile ma-ọbụ aja nsure-oku nile. Nzukọ-nsọ taa na-ejiri onyinye ibu-ọnụ na onyinye afọ-ofufo ndị ọzọ nile (tinyere oge, onyinye-chi na ihe onwunwe nile) iji nyere ndị ogbenye aka na maka ihe ndị ọzọ tozuru oke.
Buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị mee udo, ma mgbe ahụ bịa nye onyinye gị, Mat. 5:23–24 .
E nwere ọtụtụ onyinye nke mụọ, 1 Ndị-Kọ 12:4–10 .
Were nụ obi na-anụ ọkụ chọọ onyinye ndị ahụ nke kachasị mma, 1 Ndị-Kọ 12:31 .
Onyinye ọbụla zuru oke si n’aka Chineke, Jemes 1:17 .
Ike nke Mụọ Nsọ bụ onyinye Chineke, 1 Nif. 10:17 .
Nye mkpụrụ-obi unu nile dịka ihe-onyinye nye Kraịst, Ọmnaị 1:26 .
Ndị ahụ na-asị na-ọdịghị onyinye ọbụla dị a maghị ozi-ọma nke Kraịst, Mọm. 9:7–8 .
Ọbụrụ na mmadụ enye onyinye, ma ọbụghị ma o ji ezigbo ebum-n’obi nye ya, ọ dịghị uru ọ ga-abara ya, Moro. 7:6 .
Onyinye ọbụla dị mma si na Kraịst bịa, Moro. 10:8–18 .
A gaghị ewepụ ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja ahụ ọzọ, ruo mgbe ụmụ ndịkom nke Livaị ga-enye Onye-nwe onyinye ọzọ n’ezi-omume, OznỌd. 13:1 .
Ndụ ebighi-ebi bụ onyinye nke kachasị ukwuu n’onyinye nile nke Chineke, OznỌd. 14:7 (1 Nif. 15:36 ).
Onyinye nile ka e nyere ndị ahụ hụrụ Onye-nwe n’anya, OznỌd. 46:8–11 .
Mmadụ nile e nweghị onyinye nile e nyere ha, OznỌd. 46:11–29 .
Na nke a, n’ụbọchị nke Onye-nwe, unu ga-enye onyinye unu nile na oriri-nsọ nile nye Onye kachasị Elu, OznỌd. 59:12 .
Ka anyị dịka otu Nzukọ-nsọ na otu ndị nye Onye-nwe onyinye n’ezi-omume, OznỌd. 128:24 .