Inwe ume e ji eme ihe. Inwe ike n’ebe mmadụ ma-ọbụ ihe nọ bụ inwe ume ituzi aka ma-ọbụ tinye iwu nye onye ahụ ma-ọbụ ihe ahụ. N’ime akwụkwọ-nsọ nile, ike ka a na-ejiko ọtụtụ mgbe ya na ike nke Chineke ma-ọbụ ike nke elu-igwe. Ọtụtụ mgbe o metụtara nso-nso ikike nke ọkwa nchụ-aja, nke bụ nkwenye ma-ọbụ ihe ruru mmadụ ime omume maka Chineke.
N’ihi nke a ka m guzoworo gị, ka m we mee ka a hụ ike m n’ime gị, Ọpụ. 9:16 .
Chineke bụ ume na ike m, 2 Sam. 22:33 .
E gbochila ezi ihe mgbe ọ dị n’ike nke aka gị ime ya, Ilu 3:27 .
N’ezie mụ onwe m jupụtara n’ike site na mụọ nke Onye-nwe, Maịka 3:8 .
E werewo ike nile di n’elu-igwe na n’elu ụwa nye m, Mat. 28:18 .
Ozizi ya wee tụ ha n’anya, n’ihi n’okwu ya dị n’ike, Luk 4:32 .
Nọdụnụ n’obodo a, ruo mgbe a ga-ewere ike si n’elu yikwasị unu, Luk 24:49 .
Ka ha ra bụ ndị natara ya, ha ka o nyere ike ịghọ ụmụ ndịkom nke Chineke, Jọn 1:12 (OznỌd. 11:30 ).
Unu ga-anata ike, mgbe Mụọ Nsọ ga-abịakwasịworị unu, Ọlndoz. 1:8 .
Ọ dịghị ike ọchịchị ma ọbụrụ na Chineke edoghị ya, Ndị-Rom 13:1 .
E dobere unu n’ike nke Chineke site n’okwukwe ruo na nzọpụta, 1 Pita 1:3–5 .
Ọbụnadị na mmadụ nwere ike ịrụ ọtụtụ oke ọrụ, mana ọ bụrụ na o tuo ọnụ n’ihi ike nke ya, ọ ghaghị ida, OznỌd. 3:4 .
Ike ahụ iji mee ihe ọma di n’ime onye ọbụla, OznỌd. 58:27–28 .
N’ime emume-nsọ nile nke Ọkwa nchụ-aja nke Melkizedek, ike ahụ nke ndụ iyi-Chineke na-apụta ìhè, OznỌd. 84:19–22 .
Ùgwù nile nke ọkwa nchụ-aja jikọrọ ọnụ na-enweghị ókè ya na ike nile nke elu-igwe, OznỌd. 121:34–46 .