Gbaa-ama Hụ kwa Ịgba-ama, Ọgbụgba-ama Ịgba aka-ebe site n’ike nke Mụọ Nsọ; Ịma-ọkwa dị oke mkpa maka ezi-okwu gbadoro-ụkwụ na mmata nke onwe ma-ọbụ nkwenye. Onye nkasi-obi ahụ ga-agbara m ama, Jọn 15:26. O nyere anyị iwu ka anyị kwusaa ozi-ọma ma gbaa-ama, Ọlndoz. 10:42. Ndị aka-ebe mmadụ atọ ga-agba-ama banyere ezi-okwu ahụ, 2 Nif. 27:12. Ike nke Mụọ Nsọ na-eburu ya baruo n’obi nke ụmụ nke ndị mmadụ, 2 Nif. 33:1. Akwụkwọ-nsọ nile na-agba-ama gbasara Kraịst, Jekọb 7:10–11 (Jọn 5:39). Ana m agbara unu ama na ama m n’ihe ndị a m gwaworo unu maka ha bụ ezi-okwu, Alma 5:45 (Alma 34:8). Unu ga-agba ama maka ha site n’ike nke Chineke, OznỌd. 17:3–5. Nke ahụ nke Mụọ gbara-ama nye unu, ka unu mee, OznỌd. 46:7. E zipụrụ m unu ịgba-ama ma dọọ kwa ndị mmadụ aka na ntị, OznỌd. 88:81.