Ife-arụsị Ịkpọ-isi-ala nye arụsị nile ma-ọbụ nkedo karịrị akarị ma-ọbụ nyefee onwe kpam kpam nye ihe ọbụla. Gi enwela chi ọzọ tinyere m, Ọpụ. 20:3 (Mosa. 12:35; 13:12–13). Ọbụrụ na unu ga-achụso chi-ọzọ nile, unu aghaghị ịla n’iyi, Deut. 8:19. Ekwegh-ekwe bụ dịka oke ajọọ omume na ife arụsi, 1 Sam. 15:23. I chọtawo onwe gị nye onye ọzọ karịa m, Aịsa. 57:8. Ị jawo kwa chi nile nke ọla ọcha na ọla edo mma, Dan. 5:23. Unu apụghị ibu oru Chineke na nke akụ na ụba, Mat. 6:24. Anya-ukwu bụ ikpere arụsị, Ndị-Kọl. 3:5. Ụmụ ntakịrị chee nụ onwe unu nche ka unu ghara ikpere arụsị, 1 Jọn 5:21. Ahụhụ na-adiri ndị na-efe arụsị apịrị-apị, 2 Nif. 9:37. Ife-arụsị nke ndị Nifaị wekwasịrị ha agha ha nile na mbibi ha nile, Alma 50:21. Onye ọbụla na-aga na-achụso udị chị nke ya, OznỌd. 1:16. Ka ha jiri aka ha rụọ-ọrụ ka a ghara inwe ife-arụsị, OznỌd. 52:39. Nna Abraham ka ife-arụsi duuru pụọ, Abr. 1:27.