Irube-isi, Nrube-isi, Rube-isi Hụ kwa Gọzie, Gọziri, Ngọzi; Iwu; Iwu-nsọ nile nke Chineke; Jee-ije, Soro Chineke jegharịa; N̄aa-ntị; Ọn̄ụ N’uche nke mụọ, irube-isi bụ ime uche Chineke. Noa wee mee dịka iwu nile siri dị nke Chineke nyere ya, Jen. 6:22. Abraham wee rubere-Onye-nwe isi, Jen. 22:15–18. Ihe nile Onye-nwe kwuworo, anyị ga-eme ha, Ọpụ. 24:7. Ya mere, nụrụ O Israel, lezikwa anya ime ya, Deut. 6:1–3. Hụ Onye-nwe n’anya ma gee ntị rubere olu ya isi, Deut. 30:20. Irube-isi dị mma karịa ịchụ-aja, 1 Sam. 15:22. Tụọ egwu Chineke, debe kwa iwu-nsọ ya nile, Ekl. 12:13–14. Ọ bụghị onye ọbụla ga-aba n’ala-eze nke elu-igwe, kama onye nke na-eme ọchịchọ nke Nna, Mat. 7:21 (3 Nif. 14:21). Ọ bụrụ n’onye ọbụla achọọ ime ihe Ọ na-achọ, ọ ga-amara, ma ozizi ahụ o sitere na Chineke, Jọn 7:17. Anyị aghaghị irubere Chineke isi karịa mmadụ, Ọlndoz. 5:29. Ụmụ, rubere nụ ndị mụrụ unu isi, Ndị-Efe. 6:1 (Ndị-Kọl. 3:20). A ga m eje mee ihe ndị ahụ Onye-nwe nyere n’iwu, 1 Nif. 3:7. Erubere m isi n’olu nke Mụọ ahụ, 1 Nif. 4:6–18. Ọ bụrụ na ụmụ nke mmadụ edobe iwu-nsọ nile nke Chineke, ọ na-enyeju ha afọ, 1 Nif. 17:3. Kpachapụnụ anya na-eleghị-anya ka unu ghara irube isi nye mụọ ọjọọ, Mosa. 2:32–33, 37 (OznỌd. 29:45). Ndị mmadụ na-anata ọkwụkwụ-ụgwọ ha dịka mụọ ahụ nke ha na-erubere isi, Alma 3:26–27. Ndị mmadụ kwesịrị ime ọtụtụ ihe site n’ọchịchọ nke onwe ha, OznỌd. 58:26–29. Onweghị ihe mmadụ ji emehie Chineke, ma-ọbụghị ndị ahụ na-anaghị ekwupụta aka-ọrụ ya n’ihe nile ma anaghị erube-isi n’iwu-nsọ ya nile, OznỌd. 59:21. Mụ Onye-nwe ka a na-amanye mgbe unu mere ihe m kwuru, OznỌd. 82:10. Mkpụrụ obi ọbụla nke na-erube-isi n’olu m, ga-ahụ iru m ma mata na A Bụ M, OznỌd. 93:1. A ga-atarịrị ndị mmadụ ahụhụ ruo mgbe ha mụtara irube-isi, OznỌd. 105:6. Mgbe anyị nwetara ngọzi ọbụla site n’aka Chineke, ọbụ site na nrube-isi nye iwu ahụ nke ọ gbadoro ukwu na ya, OznỌd. 130:21. Adam rubere isi, Moses 5:5. Anyị ga-anwale ha jiri nke a, ịhụ ma ha ga-eme ihe nile bụ ihe ọbụla Onye-nwe ga-enye ha n’iwu, Abr. 3:25.