Ụba aku Hụ kwa Ego; Mpako Akụ ma-ọbụ uju. Onye-nwe na-enye Ndị-nsọ ndụmọdụ ka ha ghara ịchọ ụba akụ nke ụwa ewezuga iji mee ihe ọma. Ndị-nsọ agaghị edoberịrị ịchọ ụba akụ nke ụwa n’iru tutu chọwa ala-eze nke Chineke, nke na-ejide ụba akụ nile nke ebighi-ebi (Jekọb 2:18–19). Mgbe akụ na-abakarị ụba, unu atụkwasịla obi unu na ha, Abụọma 62:10. Akụ adịghị aba uru n’ụbọchị nke oke iwe, Ilu 11:4. Onye na-atụkwasị obi n’akụ ya onye ahụ ga-ada, Ilu 11:28. Ihe a na-ahọrọ ka ezi aha bụ karịa nnukwu ụba-akụ, Ilu 22:1. Lee otu ọ dịịrị ndị nwere akụ ike ịba n’ala-eze Chineke, Mak 10:23 (Luk 18:24–25). Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ ihe ọjọọ nile, 1 Tim. 6:10. Ahụhụ na-adịrị ọgaranya ndị na-eleda ndị ogbenye anya ndị akụ ha bụkwa chi ha, 2 Nif. 9:30. Ndị ezi-omume etinyeghị obi ha nile na ụba akụ mana ha kerịtara ihe, ha na mmadụ nile, Alma 1:30. Ndị mmadụ ahụ malitere ime mpako n’ihi ụba akụ nile, Alma 4:6–8. A malitere igosi ihe dị iche na ndị ahụ site n’ọkwa dịka ụba akụ ha nile siri dị, 3 Nif. 6:12. A chọla ụba akụ kama chọọ amamihe, OznỌd. 6:7 (Alma 39:14; OznỌd. 11:7). Ụba akụ nile nke ụwa bụ nke Chineke inye, kama kpachapụ anya maka mpako, OznỌd. 38:39. Ụba akụ nke mgbe ebighi-ebi Kpadonụ ụba akụ unu n’elu-igwe, Mat. 6:19–21. Ugboro ole ka m kpọworo unu site na ụba akụ nke ndụ ebighi-ebi, OznỌd. 43:25. Ụba akụ nke mgbe ebighi-ebi bụ nke m inye, OznỌd. 67:2 (OznỌd. 78:18).