Mmehie n’enweghị mgbaghara Hụ kwa Igbu-mmadụ; Ikwuhie Chineke, Nkwuhie Chineke; Mụọ Nsọ; Ụmụ ndịkom nke ịla-n’iyi Mmehie nke ịgọnarị Mụọ Nsọ, otu mmehie na e nweghị ike ịgbaghara. Nkwuhie Chineke megide Mụọ Nsọ, a gaghị agbaghara ya nye mmadụ, Mat. 12:31–32 (Mak 3:29; Luk 12:10). Ọ bụ ihe a na-apụghị ime bụ ime ka ndị e mere ka ha keta Mụọ Nsọ, ime ka ha buru ndị-ọhụrụ ọzọ nye nchegharị, Ndị-Hib. 6:4–6. A sị n’anyị were ọchịchọ obi na-anọ na mmehie mgbe anyị nataworo mmata nke ezi-okwu, aja a ga-achụ banyere mmehie nile a fọdụghị ọzọ, Ndị-Hib. 10:26. Ọbụrụ na ị gọnarị Mụọ Nsọ mgbe ị matara na ị na-agọnarị ya, nke a bụ mmehie na-enweghị mgbaghara, Alma 39:5–6 (Jekọb 7:19). Ha enweghị mgbaghara, ebe ha gọnarịworo Ọkpara a Mụrụ Nanị Ya, ebe ha kpọgideworo ya nye onwe ha, OznỌd. 76:30–35. Nkwuhie Chineke megide Mụọ Nsọ, a gaghị a gbaghara ya nke bụ ịkwafu ọbara onye ikpe na-amaghị mgbe unu natasịworo ọgbụgba-ndụ ọhụrụ nke mgbe nile na-adịgide, OznỌd. 132:26–27.