Iwe bụ izipụta ọnọdụ uche. Onye-nwe nyere ndị nsọ ya nile ndụmọdụ ka ha na-ejigide onwe ha gbasara iwe (Mat. 5:22 ). Obụghị nna ma-ọbụ nwa kwesịrị ikwutọ ndị ọzọ n’ezi na ụlọ. N’ime akwụkwọ nsọ nile, iwe nwere ọmụmatụ ihe dịke ọkụ (2 Nif. 15:25 ; OznỌd. 1:13 ).
Ma Ken wee wee iwe dị ọkụ nke ukwuu, na iru ya wee gbarụọ, Jen. 4:5 .
Onye-nwe adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, ma dị kwa ukwuu n’ebere, Abụọma 145:8 .
Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ, Ilu 15:1 .
Onye-ọnụma na-akpali ise-ọkwu, mana Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ-ọsọ na-eme ka ise okwu dajuọ, Ilu 15:18 (Ilu 14:29 ).
N’ihi aha m ka m na-eme ka iwe m nọọ ọdụ, Aịsa. 48:9 .
Agbasawo m aka m nile nye otu ndị ahụ na-aga n’iru na-akpasu m iwe, Aịsa. 65:2–3 .
Onye ọbụla ga-eti gị ụra na nti aka nri, tụgharịkwara ya na nti nke ọzọ, Mat. 5:39 .
Unu ndị bụ nna, unu akpasukwala ụmụ unu iwe, Ndị-Efe. 6:4 .
N’ihi na-agwawo m unu ezi-okwu, unu na-ewe iwe megide m, Mosa. 13:4 .
Aga m eleta ndị a n’iwe m, Alma 8:29 .
Onweghị onye ọ na-akpalite iwe-ọkụ ya imegide, ma ọbụghị ndị ahụ na-anaghị ekwupụta aka ọrụ ya n’ime ihe nile, OznỌd. 59:21 .
Mụ Onye-nwe ana m ewe iwe megide ndị ajọ mmadụ, OznỌd. 63:32 .