Anaghị Anwụ Anwụ, Anwụghị Anwụ Hụ kwa Aja mgbaghara mmehie, Ịchụ aja mgbaghara mmehie; Ịnwụ anwụ, N’anwụ anwụ; Jisus Kraịst; Mbilite n’ọnwụ; Nzọpụta Ọnọdụ nke ibi ndụ ruo mgbe nile n’ime ụdị nke bilitere n’ọnwụ, na-anọghị n’okpuru nke ọnwụ nke arụ. O biliwo, Mak 16:6. Ọbụna otu a n’ime Kraịst ka a ga-eme ka mmadụ nile dị ndụ, 1 Ndị-Kọ 15:22. E lomiwo ọnwụ ruo mmeri mgbe arụ na-anwụ anwụ ga-eyikwasị anwụghị anwu, 1 Ndị-Kọ 15:53–54. Kraịst emewo ka ọnwụ ghara ịdị ire ma wepụta ndụ anwụghị anwu, 2 Tim. 1:10. Anwụghị-anwụ bụ iweghachi kwa mụọ ahụ na arụ ahụ, 2 Nif. 9:13. Mụọ nile na-ejikọta ha na arụ nile ga-aghọ anwụghị anwụ, ọdịghị mgbe ha ga-anwụ-anwụ ọzọ, Alma 11:45. Ndị na-ekwesị ntụkwasị-obi ka a ga-ekpube anwụghị-anwụ na ndụ ebighi-ebi, OznỌd. 75:5. A ga-edo ụwa nsọ na anwụghị-anwụ, OznỌd. 77:1 (OznỌd. 130:9). Ọru na ebube nke Chineke bụ iweta na mmezu anwụgh-anwụ na ndụ ebighi-ebi nke mmadụ, Moses 1:39.