Taa-ahụhụ, N’ata ahụhụ Hụ kwa Ihe isi-ike Imezi gharị ihe, ma-ọbụ ọpịpịa e nyere ndị mmadụ n’onwe ha ma-ọbụ n’otu nile iji nyere ha aka imezi karịa ma-ọbụ dị-ike karịa. Ajụkwala aka ịta ahụhụ nke Onye Pụrụ Ime Ihe nile, Job 5:17 (Ilu 3:11). Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ onye nke Ị na-ata ahụhụ O Onye-iwe, Abụọma 94:12. Enyere akwụkwọ-nsọ nile maka ịtụ mmadụ mmehie ya n’iru na iji mezigharịa ihe, 2 Tim. 3:16. Onye-nwe na-ata ndị ahụ ọ hụrụ n’anya ahụhụ, Ndị-Hib. 12:5–11. Onye-nwe hụrụ na-okwesịrị ekwesị ka ọ taa ndị nke ya ahụhụ, Mosa. 23:21–22. Ewezuga ma Onye-nwe tara ndị ya ahụhụ ha agaghị echeta ya, Hil. 12:3. Onye-nwe na nwanne nwoke Jared kwurịtara okwu, ma taa ya ahụhụ, Ita 2:14. A tara ha ahụhụ ka ha nwee ike chegharịa, OznỌd. 1:27. Ndị m hụrụ n’anya ka m na-atakwa ahụhụ ka e wee gbaghara mmehie ha nile, OznỌd. 95:1. Ndị ahụ nile bụ ndị na-agaghị anagide ntaram-ahụhụ enweghị ike ịbụ ndị e doro nsọ, OznỌd. 101:2–5. Ndị m nwere mkpa ita ha ahụhụ ruo mgbe ha mụtara irube isi, OznỌd. 105:6. Onye ahụ nke na-agaghị anagide ịta ahụhụ e tozughi oke nye ala eze nke m, OznỌd. 136:31.