Erọn Nwa-nwoke nke Mosaịa Hụ kwa Mosaịa, Nwa-nwoke nke Benjamịn; Ụmụ ndịkom nke Mosaịa N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, otu nwa-nwoke nke Eze Mosaịa. Erọn jere ozi dịka onye mgbasa ozi-ọma onye ịrụsi ọrụ ya ike nyere aka na-igbanwe ọtụtụ mkpụrụ obi nye Kraịst. Ọ bụụrụ onye na-ekweghị ekwe, onye chọworo ka O bibie Nzukọ-nsọ, Mosa. 27:8–10, 34. Onye mụọ-ozi pụtara gosi ya onwe ya na ndị nile ya na ha so, Mosa. 27:11. O chegharịrị ma malite ikwusa okwu nke Chineke, Mosa. 27:32–28:8. Ọ jụrụ na-aga akpọ ya eze ma kama ọ gara n’ala nke ndị Leman ikwusa okwu nke Chineke, Alma 17:6–9. Wee buo-ọnụ kpee kwa ekpere maka nduzi, Alma 17:8–11. Wee kuziere nna Eze Lamonai, Alma 22:1–26. Gaa ikwusa ozi-ọma nye ndị Zorọm, Alma 31:6–7.