Onye nke na-azọpụta. Jisus Kraịst site na aja mgbaghara mmehie ya nyere mmadụ nile onyinye mgbapụta na nzọpụta. “Onye-nzọpụta” bụ aha na akara nke Jisus Kraịst.
Ị ga-akpọ aha ya Jisus; n’ihi ya onwe ya ga-azọpụta ndị nke ya site na mmehie ha nile, Mat. 1:21 .
Na taa ka a mụrụ nye unu onye nzọpụta, nke bụ Kraịst Onye-nwe, Luk 2:11 .
Chineke hụrụ ụwa n’anya otua na Ọkpara A Mụrụ Nanị Ya bịara ịzọpụta ndị mmadụ, Jọn 3:16–17 .
Ọdịghị aha ọzọ dị ewezuga nke Kraịst, nke a ga-esite nwe ike izọpụta mmadụ, Ọlndoz. 4:10–12 (2 Nif. 25:20 ; Mosa. 3:17 ; 5:8 ; OznỌd. 18:23 ; Moses 6:52 ).
Site n’elu-igwe anyị na-ele anya maka Onye-nzọpụta, Onye-nwe Jisus Kraịst, Ndị-Fil. 3:20 .
Nna ahụ ezitawo Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye-nzọpụta nke ụwa, 1 Jọn 4:14 .
Onye-nwe ewelitewo otu Mesaịa, Onye-nzọpụta nke ụwa, 1 Nif. 10:4 .
Nwa-atụrụ Chineke bụ Onye-nzọpụta nke ụwa, 1 Nif. 13:40 .
Ọmụma nke Onye-nzọpụta ga-agbasa ruo mba ọbụla, ebo, asụsụ na ndị mmadụ, Mosa. 3:20 .
Kraịst nwụrụ ka nzọpụta wee bịa, Hil. 14:15–16 .
Nkwado izi-ezi na ido-nsọ site n’Onye-nzọpụta bụ ihe ziri-ezi na ezi-okwu, OznỌd. 20:30–31 .
Abụ m Jisus Kraịst, Onye-nzọpụta nke ụwa, OznỌd. 43:34 .
Onye nke M Mụrụ Nanị Ya bụ Onye-nzọpụta ahụ, Moses 1:6 .
Ka ha ra bụ ndị kwere n’Ọkpara ahụ, chegharị kwara site na mmehie ha nile, ka a ga-azọpụta, Moses 5:15 .