Ịnwụ anwụ, N’anwụ anwụ Hụ kwa Arụ; Ọdịda nke Adam na Iv; Ọnwụ nke arụ; Ụwa Oge ndia site n’ọmụmụ ruo n’ọnwụ nke arụ. Nke a n’oge ụfọdụ ka a kpọrọ Ohere ndụ nke abụọ. Ụbọchị i ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị inwụ anwụ, Jen. 2:16–17 (Moses 3:16–17). N’ọnwụ mụọ ahụ ga-alaghachikwuru Chineke, ma arụ ewe laghachi n’aja nke ala, Ekl. 12:7 (Jen. 3:19; Moses 4:25). Ka mmehie ghara ịchị eze n’arụ unu nke na-anwụ anwụ, Ndị-Rom 6:12. Arụ nke a na-anwụ anwụ aghaghị iyikwasị anwụghị anwụ, 1 Ndị-Kọ 15:53 (Inọs 1:27; Mosa. 16:10; Mọm. 6:21). Ọnọdụ nke mmadụ wee bụrụ ọnọdụ nke mnwale, 2 Nif. 2:21 (Alma 12:24; 42:10). Adam dara ka mmadụ wee dịrị, 2 Nif. 2:25. Unu na-enwe olile anya, ma hụ arụ na-anwụ anwụ ekulitere na anwụghị anwụ? Alma 5:15. Ndụ nkea bụ oge ahụ dịịrị mmadụ ịkwadobe ijekwuru Chineke, Alma 34:32. Atụla ụjọ ọnwụ, n’ihi n’ime ụwa nke a on̄u unu ezughị oke, OznỌd. 101:36. Ndị ahụ na-edobe ohere ndụ nke abụọ ha ga-enwe ebube, Abr. 3:26.