Solomon Hụ kwa Batsheba; Devid N’ime Testament Ochie, otu nwa-nwoke nke Devid na Batsheba (2 Sam. 12:24). Solomon bụụrụ n’otu oge eze nke Israel. Devid wee kpọọ Solomọn dịka eze, 1 Ndez. 1:11–53. Devid wee nye Solomọn iwu ka o jee ije n’ụzọ nile nke Onye-nwe, 1 Ndez. 2:1–9. Onye-nwe kwere ya nkwa obi ịghọta ihe, 1 Ndez. 3:5–15. O kpere ikpe n’etiti ndị nne abụọ wee chọpụtakwa nke bụ nne nwanta ahụ, 1 Ndez. 3:16–28. Ọ tụrụ ilu nile na abụ nile, 1 Ndez. 4:32. O wuru temple ahụ, 1 Ndez. 6; 7:13–51. Tinye temple ahụ n’ọrụ chukwu, 1 Ndez. 8. Eze nwanyị nke Sheba letara ya, 1 Ndez. 10:1–13. Solomọn lụrụ ndị nwunye pụọ n’ezi Israel, ma ndị nwunye ya tụgharịrị obi ya ife chi ụgha nile ofufe, 1 Ndez. 11:1–8. Onye-nwe wee weso Solomọn iwe, 1 Ndez. 11:9–13. O wee nwụọ, 1 Ndez. 11:43. Devid buru amụma banyere ịdị ebube nke ịchị-eze nke Solomọn, Abụọma 72. Solomọn nwetara ọtụtụ ndị nwunye na ndị iko-nwanyị kama o nwetaghị ụfọdụ site na Onye-nwe, OznỌd. 132:38 (Jekọb 2:24).