Ubi vine nke Onye-nwe-anyị Hụ kwa Israel; Ubi Otu àkàrá maka ubi nke ọrụ nke mụọ. N’ime akwụkwọ-nsọ nile, ubi vine nke Onye-nwe dịka ọ na-emekarị na-atụnyere ụlọ nke Israel ma-ọbụ ala-eze nke Chineke n’elu ụwa. Oge ụfọdụ ọ na-atụnyere ndị mmadụ nile nke ụwa n’ọha. Ubi vine nke Onye-nwe nke usuu nke ndị-agha bụ ụlọ Israel, Aịsa. 5:7 (2 Nif. 15:7). Jisus tụrụ ilu nke ndị-ọrụ n’ime ubi vine, Mat. 20:1–16. Israel yiri osisi olive ụlọ nke a zụrụ n’ubi vine nke Onye-nwe, Jekọb 5. Ndị odibo nke Onye-nwe ga-ebecha ubi vine ya maka oge ikpeazụ, Jekọb 6. Onye-nwe ga-agọzi ndị nile na-arụ ọrụ n’ubi vine ya, OznỌd. 21:9 (Alma 28:14). Rụọ nụ ọrụ n’ubi vine m maka oge nke ikpe-azụ, OznỌd. 43:28.