Kwusaa Hụ kwa Ozi-ọma; Ọrụ mgbasa ozi-ọma Inye ozi nke na-eweta nghọta dị mma karịa banyere ụkpụrụ nke ozi-ọma ma-ọbụ ozizi. Onye-nwe etewo m mmanụ ikwusa ozi-ọma nye ndị dị umeala n’obi, Aịsa. 61:1 (Luk 4:16–21). Bilie jerue Nineve, ma kwusaa ozi-ọma nye ya, Jona 3:2–10. Site na mgbe ahụ Jisus malitere ikwusa, Mat. 4:17. Gaa nụ n’ime ụwa nile, kwusaara ihe nile e kere eke ozi-ọma, Mak 16:15. Anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, na-akpọgidere ya n’obe, 1 Ndị-Kọ 1:22–24. Ọ gara wee kwusaara ndị mụọ nọ n’ụlọ mkpọrọ ozi-ọma, 1 Pita 3:19. O nweghị ihe ọbụla dị ma ọbụghị ikwusa ozi-ọma na ịkpalite ha esepụghị aka ka e debe ha n’ịtụ egwu nke Onye-nwe, Inọs 1:23. O nyere ha iwu na ha agaghị ekwusa ozi-ọma ọbụla ma ọbụghị nchegharị na okwukwe n’Onye-nwe, Mosa. 18:20. Ikwusa okwu ahụ nwere nnukwu ike idu ndị ahụ ime ihe ahụ nke ziri-ezi, Alma 31:5. I kwesighị iche na a kpọrọ gị ka i kwusaa ozi-ọma rue mgbe a kpọrọ gị, OznỌd. 11:15. A gaghị enye ya onye ọbụla ịpụ ikwusa ozi-ọma m’ọbụghị ma e chiri onye ahụ echichi, OznỌd. 42:11. Ozi-ọma nke a ka a ga-ekwusa nye mba nile, OznỌd. 133:37. Ozi-ọma ahụ ka a malitere ikwusa site na mmalite, Moses 5:58.