Meri Magdalene Otu nwanyị n’ime Testament Ọhụrụ onye ghọrọ onye na-eso ụzọ Jisus Kraịst nyefechara onwe ya kpam-kpam. Magdalene na atụnyere Magdala, nke bụ ebe Meri si bịa. Ọ dị na ọdịda-anyanwụ nke akụkụ Oke Osimiri nke Galilee. Ọ nọ n’ebe dị nso n’obe ahụ, Mat. 27:56 (Mak 15:40; Jọn 19:25). Ọ nọọrọ n’ebe ahụ e liri Kraịst, Mat. 27:61 (Mak 15:47). O nọọkwara n’akụkụ ili ahụ n’ụtụtụ nke mbilite n’ọnwụ, Mat. 28:1 (Mak 16:1; Luk 24:10; Jọn 20:1, 11). Jisus pụtara ìhè na mbụ nye ya mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ, Mak 16:9 (Jọn 20:14–18). Mụọ ọjọọ asaa sitere n’ime ya pụọ, Luk 8:2.